User:David-Melchy
Desmund (Desmond) Onyem'uche Ihuoma bu ezigbo nwa afo Igbo, amuru na al' Igbo. Obu onye nke amuru n'obodo ukwu ana akpo Orogwe di na mpaghara Owerri (Owere). Nwa di ala tokwara n'obod o a ruo oge ona agu akwukwo elementiri nke ana akpo elementiri 4 (Primary 4). Oge eruo nne ya akporo ya na umu nne ya lawa n'obodo ha, obodo ha, ebe amuru ha (nne na nna ya), na mpaghara ukwu ana akpo Onicha, Ezinihitte-Mbaise di kwa n'Imo Steeti ,Naijiria. Ebe ahu ka obidoro gupuchaa akwukwo nke elemetiri tupu ogawa Legos ebe ogawara ka omuo ka esi azu ahia. Nwa di ala gbakpara odibo nke oma afo ise.
tutu o gaa mahadum Legos. O guru akwukwo na Obizi High School, Mbaise, sikwa ebe ahu gaa mahadum, University of Lagos bu ebe O nwetere Degree Bachelor na Master. Oge o ruru oru bekee, O si na oru Advertising Consultancy rigoo n'okwa Public Relations Manager na ulo oru ndi na amiputa Manu na Port Harcourt. O si kwa ebe ahu gaa obodo Germany ebe o na agu akwukwo maka okwa Doctorate na Performance and Media Studies.
Nwa amadi a bu ezigbo nwa afo Igbo nke na ede edemede. Oge o no na mahadum na agu akwuko maka Degree Bachelor na Electrical/Electronics Engineering, obanyere na out ana akpo ‘EDICOM’ (Editorial Committee). Out a na ahu maka edemede akuko mgbasa ozi n’ime Mahadum Legos na mpaghara ‘Faculty of Engineering’. Obu ebe a k’ono n’aru oru mgbasa ozi nke ana akpo ‘Journalist’ ma na agu kwa akwukwo digrii ya. Oritere nnukwu uru nay a bu oru edemede. O ritere uru dika onye mbu nke nwere nmeri na edemede nke Goethe Institut mere maka mahadum nile no na Afirika. Akuko o dere bu nke ndi obodo Germany weere mee ihe nkiri nke ana elele na obodo ha.
Desmund (Desmond) Onyem'uche Ihuoma edekwala otutu ihe n'ime magazine na journal nke ana akpo Articles. Ona edekwa nke ana akpo puem (poem). Onwekwara nnukwu nmasi na ihe gbasara abu ulo uka nke ana akpo Hymns na Classical Music. N’ihi nke a obu onye otu kwaya (choir) n’ebe di iche iche. Ona abu abu n’olu nke ana akpo Baz (Bass), n’etikwa ubo nke ana akpo Ogan (Organ). O bukwa onye ama ama na ulo uka nke di na Mahadum Legos, St Cecilia abu Rock music, Pop, R&B na udi ihe okike obula. Nwa amadi a abughi onye ndi ocha na eji eti egwuregwu.